5 Popular Igbo Nursery School Rhymes and translations

Obindigbo
By Obindigbo November 29, 2015 10:35

5 Popular Igbo Nursery RhymesDancing to Popular Igbo Nursery Rhymes


 

Igbo Nursery Rhyme

Onye tili nnwa na-ebe akwa?

Egbe tili nnwa na-ebe akwa

Weta uziza, weta Ose

Ka umu nnunnu racha ya

Ka o kpo otutu kpogbue ha

Tufue nu nnwa mere aru

E rue echi amuta ozo

Translation

Who beat the crying child?

The vultures beat the crying child

Bring scent leaf, bring pepper

Bring mangala fish

So the bird will come and eat

And they will die from hiccups

Throw away the child that commits sacrilege

Tomorrow we’ll have another one


 

Igbo Nursery Rhyme

Nne nne m, udu m araputa m o, udu

Nne nne m, udu m araputa m o, udu

Udu m ji echu mmiri, ifugo udu m awa, udu

Udu m ji echu mmiri, ifugo udu m awa, udu

Ukwu kporo m, udu m were waa, udu

Ukwu kporo m, udu m were waa, udu

Nne nne m, udu m araputa m o, udu

Translation:

My mother my mother, my clay water pot has failed me, water pot

My mother my mother, my clay water pot has failed me, water pot

The clay water pot I use for fetching water, have you seen my clay water pot is broken

The clay water pot I use for fetching water, have you seen my clay water pot is broken

I dashed my foot against a stone, and my clay water pot fell and broke

I dashed my foot against a stone, and my clay water pot fell and broke

My mother my mother, my clay water pot has failed me, water pot


Igbo Nursery Rhyme

Nnwa nnunu nta, Nnwa nnunu nta , turu zam zam zam turu zam

Gini ka ino ebe a eme, turu zam zam zam turu zam

Ana m aturu nne m ose, turu zam zam zam turu zam

Tu kene ka isi atu, tuuuu, tuuuu

Translation:

Little bird, Little bird, turu zam zam zam turu zam

What are you doing? turu zam zam zam turu zam

I’m picking pepper for my mother, turu zam zam zam turu zam

Pick like the head picker, tuuuuuu tuuuuuuu


 Igbo Nursery Rhyme

Kuoro nu nnwa ngwere aka, nwerente nwerente

Nnwa ngwere ejeghi ije, o gbara oso, nwerente nwerente

Nnwa ngwere ejeghi ije, o gbara oso, nwerente nwerente

Peeee nwerente, hiiiaaan nwerente, aah eeh nwerente

Translation:

Clap for the little lizard, nwerente nwerente

Little lizard did not walk, it ran, nwerente nwerente

Peeee nwerente, hiiiaaan nwerente, aah eeh nwerente


 

 Igbo Nursery Rhyme

Onye enena anya n’azu, Nnekwu mmanwu na-abia anyi n’azu

Onye enena anya n’azu, Nnekwu mmanwu na-abia anyi n’azu

Onye nee anya n’azu, mmanwu apia ya utari

A, B, C, D, 1, 2, 3, 4, anyi ga-ebiri utara si mama tankiyu

Translation:

Let no one look behind, a big masquerade is behind us,

Let no one look behind, a big masquerade is behind us,

If anyone looks back, the masquerade will flog the person,

A, B, C, D, 1, 2, 3, 4, we shall eat akpu and say “mummy thank you

Comments

comments

Obindigbo
By Obindigbo November 29, 2015 10:35